Loading

Alison's New App is now available on iOS and Android! Download Now

Coronavirus - Ihe i kwesiri ima

Usoro nkuzi ihe a nke bu n'efù na akọwa ihe ndi dị mkpa maka oria coronavirus Covid-19.

Publisher: Advance Learning
Usoro nkuzi a n'ịntanetị n'efu maka oria coronavirus na-elekwasị anya na akụkọ ntolite, nnyefe, ihe-mgbaàmà, ọgwụgwọ ga-ekwe omume na mgbochi nke coronavirus. Na nzaghachi banyere mgbasa nke Coronavirus ọhụrụ a - Alison, dịka akụkụ nke nzaghachi mba ụwa emeputala usoro mmụta n'efu maka ihe ndị mmadụ kwesịrị ịma banyere coronavirus, akuko banyere ya, uzo kachasị mma isi nagide egwu nke ọ na-eyi gị, ndi ezi na ulo gi na ndi obodo gi.
Coronavirus - Ihe i kwesiri ima
  • Duration

    1.5-3 Hours
  • Students

    145
  • Accreditation

    CPD

Description

Modules

Outcome

Certification

View course modules

Description

Usoro mmụta a dị n'ịntanetị nke a na-amụ n'efu maka CoronaVirus na-elekwasị anya n'akụkọ ihe mere eme banyere ya bụ́ nje ọ́rià, ihe mgbaàmà ya, ụzọ o sị agbasa na ụzọ a pụrụ isi gbochie nje ahụ a na-áchọ́pụ̀tatụ̀beghi n'ahụ ụmụ mmadụ. Coronaviruses (CoV) sị̀ na nnukwu ezinụlọ ọrịa nke na-akpata ọrịa site n'oyi ọmụma ruo n'ọrịa ndị ọzọ siri ike, dịka Middle East Respiratory Syndrome (MERS-CoV) na Severe Acute Respiratory Syndrome (SARS-CoV) Coronaviruses bụ Zoonotic, nke pụtara na ọ na-agbasa site n'anụmanụ banye na mmadụ.

Ọmụmụ ihe a ga-ekwu banyere otu ntiwapụ nke nje a nwere ike isi bute nsogbu ahụike nyé ụmụ mmadụ ndị butere ya, nakwa ihe isike ọ pụrụ iwetara akụrụngwa ahụike na obodo ebe ihe ahụ bilitere. Ihe mgbaàmà a na-ahụkarị na ndị bu ya bụ Ihe isike n'iku ume, ahụ ọkụ, ụkwara, iku ume ọsọ ọsọ. N'okwu ndị ka njọ, I bute ọrịa a nwere ike ikpata oyi ịba ahụ, enweghị ike iku ume nke ọma, akụrụ ịkwụsi ịrụ ọrụ na ọbụna ọnwụ.

Ihe ọmụmụ a bụ ebumnuche pụrụ iche, nke sitere n'ozi sitere na World Health Organisation (WHO), Geneva, Switzerland, na CDC (Center of Disease Control, USA). Usoro mmụta a bụ ótù akụkụ nke atụmatụ ọhụrụ nke Alison iji mepụta usoro asambodo mmụta zuru ụwa ọnụ iji lụsoo ọrịa na-éfe èfé ọgụ. A ga-emelite mmụta a kwa ọnwa. Maka àgbàm ume banyere ihe ọmụma na ịma ihe na eme eme banyere nje oria a nakwa iji ghọta egwu ya, Alison meputakwara usoro ihe ọmụma nke aga enye ndi mụchara ya asambodo nke dị na PDF n’efu n’uwa n’iile. Site na imu usoro mmụta a, ị ga ama ihe niile na eme eme banyere otu ị ga - esi merie egwu nke coroanvirus nke pụrụ idabara gị ma ọ bụ ndị ọzọ. Yabụ, gịnị ka I na echere? Bido usoro a taa, n'ime otu awa ma ọ bụ abụọ ị nwetala ihe omuma iji nyere onwe gị aka ichebe onwe gị, ezinụlọ gị na ndị obodo gị pụọ ná ibute na igbasa coronavirus.

Start Course Now

Careers